N’ụbọchị Wednesde, ihe ngosị ebe onye bụbụrụ onye isi ala Naịjiria bụ Olusegun Obasanjo, na-akọwa ọchịchị etiti dịka “adịghị ike n’ọrụ ha”, ma na-agwa ha ka ha ghara iweghachita ajọ ọnọdụ dị otú ahụ, apụtala ihe na soshal midia.
Ụfọdụ ndị bipụtara ozị ahụ, kwụrụ na Obasanjo na-akọtọ ọchịchị Tinubu.
Tunde Ednut, onye na-ebipụta ozị amara nke ọma, bipụtara nya bụ ihe ngosi na asafe Instagram ya nwere ndị na-eso ya karịrị mmadụ nde ise (5 million followers ). E chekwara ya ebe a.
Na ihe ngosi nke Ednut bipụtara a atukwasara ihu Tinubu n’elu ya.
E jiri isi okwu na-akọwa nkutu ume: “hmmmmmmmm” were bipụta ya. O nwetakwala mbiputaghari karịrị puku abụọ (2,000 reposts), nkwenye iri abuo n’itolu (29,000 likes), ntụnye ọnụ puku abụọ na narị asatọ (2,800 comments), na nkesa otu puku na narị asaa (1,700 shares).
E bipụtara ihe ngosi ahụ n’ụdị ọzọ na X, ma sị n’ọbụ Tinubu ka a na-ekwu maka ya.
Onye ọzọ na X bụ @ejykmykel1, jịrị ị́sị́ okwu na-ekwu ” onye isi Aremu Obasanjo, ikwuọla ofuma, APC agaghị anabata nke a”.
Nya bụ ozị na X enwetala mbipụtagharị puku abụọ na narị itolu (2,900 reposts), ntụnye ọnụ otu narị n’iri isii (160 quotes), nkwenye puku anọ na narị itolu (4,900 likes), na nchekwa ịgụ oge ọzọ nari asatọ n’iri ise n’ise (855 bookmarks).
Onye ọzọ na X bụ @ukocarter jiri isi okwu na-ekwu ” Tinubu adaka mba, adịghị ike ya emela ọtụtụ ụlọrụ ka ha mechie, ekwekwala ya ka ọbiaghachi n’ọchịchị nke ugboro abụọ” — OBJ” were bipụta otu ihe ngosi ahụ.
ŃNYÓCHÁ
Na nya bụ ihe ngosi, Obasanjo a kpoghị Tinubu aha.
Nyocha anyị jiri Google Lens were mee gosiri na ihe ngosi ahụ aputala ihe na soshal midia kamgbe ọnwa April nke afọ 2018.
E bipụtara ihe ngosi ahụ ebe a, ebe a n’ebe a.
Oba ozi ma nke ha riri dịka TheCable, Channels Television na Punch bipụtara okwu Obasanjo n’ubochi abụọ nke ọnwa April nke afọ 2018.
E sere ihe ngosi ahụ mgbe Obasanjo nabatara ndị otu New Nigeria group na ọdụ agumakwukwo Olusegun Obasanjo Presidential Library dị na Abeokuta, isi obodo Ogun steeti.
Mgbe ahụ, Obasanjo kọtọrọ ọchịchị onye bụbụrụ onye isi ala Muhammadu Buhari n’ihi ọnọdụ aku n’ụba Naijiria ka odi n’ọnwa April 2018.
Obasanjo kwụrụ na Naijiria nọ na mmekpa ahụ ọchịchị Buhari.
Buhari chịrị Naijiria bido n’afọ 2015 ruo 2023.
Tupu ntụnye ọnụ Obasanjo n’afọ 2018, o degaara Buhari akwụkwọ ka ọ chefuo izọ ọkwa onye isi ala ọzọ na 2019 n’ihi omume ya n’ọchịchị.
Obasanjo akwadoghị nlọghachị Buhari n’ọchịchị na ntụliaka elu nke n’afọ 2019.
NCHỊ́KỌ́TÁ
Ihe ngosi ebe Obasanjo na-akọtọ ọchịchị etiti maka ọnọdụ akụ n’ụba abụghị ọchịchị Tinubu ka ọ na-akọtọ, o sitere n’afọ 2018.
Leave a Reply